Ilu 13 IGBOB

1 Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya:Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.

2 Site na nkpuru nke ọnu-ya ka onye ọ bula gēri ezi ihe:Ma nkpuru-obi ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēri ime-ihe-ike.

3 Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya:Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya.

4 Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu:Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.

5 Okwu-ugha ka onye ezi omume nākpọ asì:Ma onye nēmebi iwu nēsì ísì, we nwe iru-ihere.

6 Ezi omume nēchebe onye zuru okè n'uzọ:Ma nmebi-iwu nēme ka onye-nmehie kpùe iru.

7 O nwere onye nēme onwe-ya ọgaranya, ma ọ dighi ihe ọ bula o nwere:O nwere onye nēme onwe-ya ob͕eye, ma àkù-ya bara uba.

8 Ihe-nb͕aputa nke ndu onye ọ bula bu àkù-ya:Ma ob͕eye anughi ibasi-nba-ike.

9 Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu:Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.

10 Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa:Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.

11 Àkù nke sitere n'ihe-efu gēbilata:Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba.

12 Nchere anēchere ogologo mb͕e di anya nēme ka obi nāria ọria:Ma osisi nke nēnye ndu ka ihe anāchọsi ike bu, mb͕e ọ biaruworo.

13 Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya:Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ.

14 Iwu onye mara ihe bu isi-iyi nke ndu,Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.

15 Ezi uche nēnye amara:Ma uzọ ndi-nghọb͕u bu nání nkume.

16 Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu:Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ.

17 Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ:Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu.

18 Inọ-n'ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti:Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru.

19 Mb͕e ihe anāchọsi ike mere ọ nātọ nkpuru-obi utọ:Ma ọ bu ihe-árú n'anya ndi-nzuzu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha.

20 Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe:Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.

21 Ndi-nmehie ka ihe ọjọ nāchu:Ma ndi ezi omume ka agākwughachi ezi ihe.

22 Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya;Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu.

23 Ọtutu ihe-oriri di n'ubi ndi-ob͕eye:Ma o nwere nke anēkpochapu site n'ikpe nābughi ikpe.

24 Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì:Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike.

25 Onye ezi omume nēri ihe rue mb͕e afọ juru nkpuru-obi-ya:Ma afọ ndi nēmebi iwu, ihe nākọ ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31