Ilu 11 IGBOB

1 Ihe-osìsì aghughọ bu ihe-árú n'anya Jehova:Ma nkume-isì-ihe zuru ezu bu ihe nātọ Ya utọ.

2 Nganga bia, nlelì abia kwa:Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di.

3 Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha:Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha.

4 Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe:Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.

5 Ezi omume nke onye zuru okè gēme ka uzọ-ya zie ezi:Ma nmebi-iwu nke aka ya ka onye nēmebi iwu gēji da.

6 Ezi omume nke ndi ziri ezi gānaputa ha:Ma n'ọchichọ nke ha nāchọsi ike ka agānwude ndi nāghọb͕u aghọb͕u.

7 Mb͕e madu nke nēmebi iwu nwuru, olile-anya-ya gāla n'iyì:Ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n'iyì.

8 Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu,Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya.

9 Ọnu-ya ka onye emeruru emeru ji ebibi madu-ibe-ya:Ma ihe-ọmuma ka agēji dọputa ndi ezi omume.

10 N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ:Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di.

11 Eji ngọzi nke ndi ziri ezi bulie obodo:Ma eji ọnu ndi nēmebi iwu akwada ya.

12 Onye nēleda madu-ibe-ya anya, obi amam-ihe kọrọ ya:Ma onye-nghọta nāb͕a nkiti.

13 Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo:Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu.

14 Mb͕e ọ nādighi ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda:Ma nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.

15 Aghaghi imejọ madu, mb͕e ọ nọworo onye ala ọzọ na mbe:Ma onye nākpọ ndi nānara madu n'aka ibu ndi-mbe asì, ọ nọ na ntukwasi-obi.

16 Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike:Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike.

17 Onye nēmeso nkpuru-obi-ya ezi ihe ka onye-ebere bu:Ma onye nēmekpa anu-aru nke aka ya aru ka onye nēnweghi obi-ebere bu.

18 Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha:Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi.

19 Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu:Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya.

20 Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu:Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu.

21 Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ:Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.

22 Dika nb͕a-aka ọla-edo n'imi ezì,Otú a ka nwanyi mara nma nke nēsi n'ezi uche wezuga onwe-ya di.

23 Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe:Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe.

24 O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari;O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ.

25 Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba:Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ.

26 Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya:Ma ngọzi n'isi onye nēre ya.

27 Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ:Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya.

28 Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda:Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú.

29 Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe:Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe.

30 Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu;Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu.

31 Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa:Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31