Ilu 19 IGBOB

1 Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya,Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu.

2 Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma;Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ.

3 Uche b͕agọrọ ab͕agọ nke madu nēkpù uzọ-ya iru;Ọ bu kwa imegide Jehova ka obi-ya di ọku.

4 Àkù nātukwasiri madu ọtutu eyì:Ma onye nēnweghi ihe, anēkewapu ya n'ebe eyì-ya nọ.

5 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ;Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume agaghi-ewepuga onwe-ya.

6 Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua:Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì.

7 Umu-nne nile nke ob͕eye nākpọ ya asì:Ǹdi-eyì-ya gēsi aṅa ghara inọ ya n'ebe di anya kari!Ọ nāb͕aso okwu-ọnu di iche iche nke nābughi ihe.

8 Onye nēnweta obi amam-ihe nāhu nkpuru-obi-ya n'anya:Onye nēdebe nghọta gāchọta ezi ihe.

9 Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ;Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n'iyì.

10 Idi-pekepeke amaghi onye-nzuzu nma;Ò gēsi kwa aṅa ma orù nma ichi ndi-isi?

11 Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ;Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.

12 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu;Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.

13 Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu:Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.

14 Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu:Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka.

15 Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu;Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.

16 Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya:Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.

17 Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu,Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.

18 Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di;Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.

19 Onye oké ọnuma ganāra nra:N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.

20 Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti,Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.

21 Ọtutu èchìchè di n'obi madu;Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.

22 Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya:Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.

23 Egwu Jehova nēdubà na ndu:Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju;Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.

24 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa,Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya.

25 Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche:Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma.

26 Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga,Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.

27 Nwam, rapu inu idọ-aka-na-ntiNke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.

28 Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò:Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe.

29 Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche,Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31