10 N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ:Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di.
11 Eji ngọzi nke ndi ziri ezi bulie obodo:Ma eji ọnu ndi nēmebi iwu akwada ya.
12 Onye nēleda madu-ibe-ya anya, obi amam-ihe kọrọ ya:Ma onye-nghọta nāb͕a nkiti.
13 Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo:Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu.
14 Mb͕e ọ nādighi ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda:Ma nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
15 Aghaghi imejọ madu, mb͕e ọ nọworo onye ala ọzọ na mbe:Ma onye nākpọ ndi nānara madu n'aka ibu ndi-mbe asì, ọ nọ na ntukwasi-obi.
16 Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike:Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike.