1 Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya:Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.
2 Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ:Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.
3 Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu:Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.
4 Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya:Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.
5 Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé:Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.