22 Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu:Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.
23 Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma:Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ.
24 Aka ndi di nkọ gāchi achi:Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.
25 Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala;Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.
26 Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ:Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.
27 Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá:Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ.
28 N'uzọ ezi omume ka ndu di;Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.