3 Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu:Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.
4 Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya:Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.
5 Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé:Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.
6 Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara:Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha.
7 Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa:Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.
8 Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.
9 Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù,Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.