12 Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu,Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
13 Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u;Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú.
14 Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi:Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu.
15 Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula:Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya.
16 Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya:Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.
17 Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.
18 Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi.