17 Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.
18 Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi.
19 Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu;Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume.
20 Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì:Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu.
21 Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie:Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.
22 Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ?Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.
23 Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya:Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.