20 Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì:Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu.
21 Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie:Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.
22 Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ?Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.
23 Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya:Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.
24 Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha:Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ.
25 Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu:Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ.
26 N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di:Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.