24 Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha:Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ.
25 Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu:Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ.
26 N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di:Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.
27 Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu,Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.
28 N'uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di:Ma n'ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di.
29 Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta:Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.
30 Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu:Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu.