7 Je na ncherita-iru onye-nzuzu,I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya.
8 Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya:Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.
9 Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha:Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di.
10 Obi mara ilu nke aka ya;Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.
11 Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu:Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku.
12 Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu,Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
13 Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u;Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú.