11 Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova:Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.
12 Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu:N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.
13 Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu;Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.
14 Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu:Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.
15 N'ìhè iru eze ka ndu di;Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu.
16 Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma!Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!
17 Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha:Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.