16 Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma!Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!
17 Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha:Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.
18 N'iru ntipia ka npako nāga,Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.
19 Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala,Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha.
20 Onye nwere uche n'okwu Chineke gāchọta ezi ihe:Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.
21 Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta:Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe.
22 Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ:Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.