22 Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ:Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.
23 Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche,Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.
24 Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu,Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria.
25 Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu,Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
26 Ọchichọ-nkpuru-obi nke onye nādọb͕u onwe-ya n'ọlu adọb͕uworo ya onwe-ya n'ọlu;N'ihi na ọnu-ya erugidewo ya.
27 Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ:Ọ bu kwa n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di.
28 Onye nāb͕akuta Chineke azu nēzisa ise-okwu:Ọzọ, onye nēkwu okwu-azu nēkewa ezi eyì.