1 Ọ di nma iri iberibe achicha kpọrọ nku, ma inọ-n'udo adi ya,Kari ulo juputara n'àjà anēri nālu ọ̀gù.
2 Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere,Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.
3 Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo:Ma Onye nānwa obi bu Jehova.
4 Onye nēme ihe ọjọ nātọ nti n'ala n'eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ajọ ihe;Onye-okwu-ugha nāṅa nti ire nēkwu ihe-ila-n'iyì.