11 Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ;Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.
12 Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu,Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.
13 Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.
14 Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di:N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.
15 Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.
16 N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe,Mb͕e obi amam-ihe nādighi?
17 Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya,Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.