15 Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.
16 N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe,Mb͕e obi amam-ihe nādighi?
17 Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya,Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.
18 Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe,Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya.
19 Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya:Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.
20 Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe:Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ.
21 Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú:Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.