18 Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe,Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya.
19 Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya:Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.
20 Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe:Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ.
21 Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú:Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.
22 Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma:Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.
23 Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya,Iwezuga uzọ nile nke ikpé.
24 N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di:Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.