21 Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú:Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.
22 Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma:Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.
23 Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya,Iwezuga uzọ nile nke ikpé.
24 N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di:Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.
25 Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu,Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.
26 Ọzọ, iri onye ezi omume nra adighi nma,Ọ dighi kwa nma itib͕u ndi amara aha-ha n'ihi izi-ezi-ha.
27 Onye nēb͕ochi okwu-ọnu-ya mara ihe-ọmuma:Ọzọ, onye mọ-ya juru ajuru bu onye-nghọta.