5 Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta:Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
6 Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu;Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.
7 Ọ maghi nma n'ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma:Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n'ebe onye amara aha-ya nọ?
8 Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya:Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.
9 Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya:Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.
10 Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọtaKari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.
11 Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ;Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.