1 Ọchichọ nke ya onwe-ya nāchọsi ike ka onye nēkewapu onwe-ya nāchọ,Ọ bu ezi nzube-ihe nile ka ọ nālusosi ọ̀gù ike.
2 Nghọta adighi-atọ onye-nzuzu utọ,Kama ọ bu nání ka obi-ya we kpughe onwe-ya.
3 Mb͕e onye nēmebi iwu nābata, nleda-anya abatawo kwa,Ọ bu kwa nlelì ka ita-uta soro.
4 Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu;Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.
5 Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma,Iwezuga onye ezi omume n'ikpé.Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n'ilu-ọ̀gù,
6 Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.
7 Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi,Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.