15 Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma;Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.
16 Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara,Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.
17 Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya;Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya.
18 Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi,Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa.
19 Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike:Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu.
20 Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula;N'ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya.
21 Ọnwu na ndu di ire n'aka;Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.