11 Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ;Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.
12 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu;Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.
13 Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu:Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.
14 Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu:Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka.
15 Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu;Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.
16 Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya:Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.
17 Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu,Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.