17 Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu,Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.
18 Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di;Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.
19 Onye oké ọnuma ganāra nra:N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.
20 Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti,Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.
21 Ọtutu èchìchè di n'obi madu;Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.
22 Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya:Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.
23 Egwu Jehova nēdubà na ndu:Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju;Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.