24 Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa,Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya.
25 Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche:Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma.
26 Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga,Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.
27 Nwam, rapu inu idọ-aka-na-ntiNke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.
28 Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò:Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe.
29 Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche,Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.