1 Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile,Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;
2 Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala,We wezuga obi-gi inwe nghọta;
3 E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku,Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;
4 Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya: