8 Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.
9 Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.
10 N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi,Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;
11 Ìzùzù ganēche gi nche,Nghọta gēchebe gi:
12 Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ,N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;
13 Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi,Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri;
14 Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ,Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;