1 Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu;Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.
2 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu:Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.
3 Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù:Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike.
4 N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi;Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.