12 Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ,Jehova emewo ọbuná ha abua.
13 Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile;Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.
14 Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi:Ma mb͕e ọ laworo n'ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi.
15 Ọla-edo di, na ọtutu ruby:Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu.
16 Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.
17 Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha;Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu.
18 Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike:Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.