2 Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu:Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.
3 Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù:Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike.
4 N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi;Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.
5 Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n'obi madu bu;Ma onye-nghọta gādọputa ya.
6 Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya:Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya?
7 Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya,Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.
8 Eze nke nānọkwasi n'oche ikpéJi anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile.