24 N'aka Jehova ka nzọ-ukwu nile nke madu nēsite;Màdu gēsi kwa aṅa ghọta uzọ-ya?
25 Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ,Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju.
26 Ọ nāfuchapu ndi nēmebi iwu, bú eze mara ihe,Ọ nēme kwa ka wheel nsucha-ọka laghachi n'elu ha.
27 Oriọna Jehova ka ume ndu madu bu,Nēgwuputa ime-ime-ala afọ nile.
28 Ebere na ezi-okwu nēchebe eze:O ji kwa ebere akwagide oche-eze-ya.
29 Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu:Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa.
30 Ufiri-utali nke nēmeru aru nēchichapu ihe ọjọ:Iti-ihe nēru kwa ime-ime-ala afọ.