27 Oriọna Jehova ka ume ndu madu bu,Nēgwuputa ime-ime-ala afọ nile.
28 Ebere na ezi-okwu nēchebe eze:O ji kwa ebere akwagide oche-eze-ya.
29 Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu:Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa.
30 Ufiri-utali nke nēmeru aru nēchichapu ihe ọjọ:Iti-ihe nēru kwa ime-ime-ala afọ.