7 Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya,Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.
8 Eze nke nānọkwasi n'oche ikpéJi anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile.
9 Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha,Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem?
10 Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.
11 Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile,Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi.
12 Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ,Jehova emewo ọbuná ha abua.
13 Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile;Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.