9 Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha,Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem?
10 Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.
11 Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile,Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi.
12 Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ,Jehova emewo ọbuná ha abua.
13 Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile;Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.
14 Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi:Ma mb͕e ọ laworo n'ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi.
15 Ọla-edo di, na ọtutu ruby:Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu.