27 Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú:O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?
28 Onye-àmà okwu-ugha gāla n'iyì:Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu.
29 Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike:Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.
30 Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di,Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.
31 Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha:Ma Jehova nwe nzọputa.