14 Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu:Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya.
15 Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata;Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.
16 Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba,Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.
17 Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe,Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam.
18 N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi,Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.
19 Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na JehovaKa m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi.
20 Èdetaghm i isi iheNime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma;