20 Èdetaghm i isi iheNime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma;
21 Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu,Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu?
22 Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu,Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama:
23 N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha,We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe.
24 Gi na onye-iwe abula eyì;I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:
25 Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile,We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà.
26 Abula otù nime ndi gānara madu n'aka,Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche.