22 Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu,Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama:
23 N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha,We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe.
24 Gi na onye-iwe abula eyì;I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:
25 Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile,We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà.
26 Abula otù nime ndi gānara madu n'aka,Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche.
27 Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ,N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi?
28 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi,Nke nna-gi-hà kpaworo.