6 Zulite nwata dika uzọ-ya si di,Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya.
7 Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye,Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.
8 Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi:Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa.
9 Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi;N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.
10 Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa;E, iru-uka na nlelì gākwusi.
11 Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya,Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.
12 Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma,Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru.