1 Mb͕e i soro onye nāchi achi iri nri,Ghọta nke-ọma onye ahu nke nọ n'iru gi;
2 Tukwasi kwa mma n'akpiri-gi,Ma ọ buru na onye nri-ya nātọ ya utọ ka i bu.
3 Achọsila nri utọ ya ike;Ebe nri ahu bu nri okwu-ugha.
4 Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya;Site na nghọta-gi ra ya aka.
5 Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa:N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe.