13 Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata:Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu.
14 Gi onwe-gi gēji nkpa-n'aka tie ya,We naputa nkpuru-obi-ya n'ala-mọ.
15 Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe,Obim gāṅuri, ọbuná nkem:
16 Akurum abua gāwuli kwa n'ọṅù,Mb͕e eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nēkwu ihe ziri ezi.
17 Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo:Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile.
18 N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi;Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
19 Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe,Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ.