24 Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku:Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.
25 Ka nna-gi na nne-gi ṅuria,Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.
26 Nwam, nyem obi-gi,Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.
27 N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu;Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu.
28 E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe,Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.
29 Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu?Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu?Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?
30 Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e;Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa.