28 E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe,Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.
29 Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu?Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu?Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?
30 Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e;Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa.
31 Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara,Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko,Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma:
32 N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta,Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.
33 Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi,Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu.
34 I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri,Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ.