4 Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya;Site na nghọta-gi ra ya aka.
5 Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa:N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe.
6 Erila nri nke onye nwere anya ọjọ,Achọsi-kwa-la nri utọ ya ike:
7 N'ihi na dika o si echè èchìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di:Rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ nāsi gi; Ma obi-ya adighi n'ebe i nọ.
8 Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa,Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi.
9 Ekwula okwu na nti onye-nzuzu;N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.
10 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi;Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei: