8 Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa,Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi.
9 Ekwula okwu na nti onye-nzuzu;N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya.
10 Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi;Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei:
11 N'ihi na Onye-nb͕aputa-ha di ike;Ya onwe-ya gēkpe ọnu-ha megide gi.
12 Me ka obi-gi ba n'idọ-aka-na-nti,Me kwa ka nti-gi abua ba n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma.
13 Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata:Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu.
14 Gi onwe-gi gēji nkpa-n'aka tie ya,We naputa nkpuru-obi-ya n'ala-mọ.