2 N'ihi na ipunara-madu-ihe ka obi-ha nātughari,Okwu nmeb͕u ka eb͕ub͕ere-ọnu-ha nēkwu.
3 Amam-ihe ka eji ewu ulo;Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike:
4 Site kwa n'ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputaN'àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ.
5 Onye mara ihe di ike;E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume.
6 N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha:Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
7 Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu:Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n'ọnu-uzọ-ama.
8 Onye nēchè ime ihe ọjọ,Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.