20 N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ;Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
21 Nwam, tua egwu Jehova na eze:Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:
22 N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili;Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?
23 Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe.Imata iru madu n'ikpé adighi nma.
24 Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu;Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe:
25 Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ,Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi.
26 O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu,Bú onye nāza okwu ziri ezi.