25 Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ,Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi.
26 O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu,Bú onye nāza okwu ziri ezi.
27 Dozie ije-ozi-gi n'èzí,Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n'ọhia;Emesia wu kwa ulo-gi.
28 Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n'efu;Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu?
29 Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya;M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di.
30 N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara,Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ;
31 Ma, le, o púchiri n'ogwu,Akuba kpuchiri iru-ya,Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya.