5 Onye mara ihe di ike;E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume.
6 N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha:Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
7 Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu:Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n'ọnu-uzọ-ama.
8 Onye nēchè ime ihe ọjọ,Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.
9 Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie:Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu.
10 Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu,Ike-gi pere npe.
11 Naputa ndi anāchigara ọnwu,Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.